Nziọkwa Ihe Nzuzo
South West Grid for Learning Trust Ltd (nke a na-akpọ "SWGfL", "SWG", "Grid", “Our”, “We” and “Us”) na-ejikwa StopNCII.org (weebụsaịtị) ma na-ekwe nkwa ichebe ma na-asọpụrụ ihe nzuzo gị.
Nziọkwa ihe Nzuzo a (yana usoro na ọnọdụ anyị (na swgfl.org.uk/terms) na akwụkwọ ọ bụla ọzọ e zoro aka na ya) na-akọwa etu anyị si eji data nkeonwe ọ bụla anyị na-anakọta n 'aka gị, ma ọ bụ nke ị na-enye anyị. Biko gụọ ihe ndị a na-esonụ nke ọma iji ghọta etu anyị si eji data nkeonwe gị na ihe anyị ji ya eme.
SWGfL bụ ụlọọrụ ebere edebanyere aha na ụlọ ọrụ ebe ndị otu na-ekwe nkwa ịkwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. Anyị nwere ike igosipụta data nkeonwe gị nye onye ọ bụla nọ n'ime otu anyị, nke gụnyere ụlọ ọrụ ndị dị n'okpuru anyị ma ọ bụ ụlọ ọrụ ndị ji òkè kachasị dị ka akọwara ya na ngalaba 1159 nke UK Companies Act 2006, ma ọ bụrụ na ụdị ụlọ ọrụ ndị ahụ dị.
Ozi gbasara SWGfL
South West Grid for Learning Trust Ltd: Belvedere House, Woodwater Park, Pynes Hill, Exeter, EX2 5WS. Ụlọ ọrụ ntụkwasị obi maka ọrụ ebere (charitable trust company) edebanyere aha na England na Wales. Nọmba Ụlọ Ọrụ: 5589479, Nọmba Ọrụ Ebere: (England na Wales) 1120354 (Scotland) SC051351, Nọmba VAT: GB 880 861 888.
N'ozuzu
- Ọkwa Nchekwa Ihe Nzuzo a na-akọwa otu anyị si eji ma na-echebe data gị gbasara otu i ji www.StopNCII.org eme ihe. Mgbe ị banyere na webụsaịtị a, anyị na-anakọta data gị n’obere oke ma anyị agaghị agbazekwa data gị karịa ka ọ dị mkpa.
- Maka ebumnuche nke iwu nchedo data nke UK, anyị bụ onye nchịkwa maka ịgbazekwa data gị ebe ị nwere:
- banyere na webụsaịtị anyị; na/ma ọ bụ
- jiri ọrụ anyị dị iche iche mee ihe site na webụsaịtị anyị;
- Anyị nwere ike iwere ụlọ ọrụ ndị ọzọ na/ma ọ bụ ndị mmadụ ọzọ n’ọrụ ka ha rụọrọ anyị ụfọdụ ọrụ. Ruo n’ókè ha chọrọ ohere ịnweta data gị (ma ọ bụrụ na anyị enweghị ike iru ihe anyị chọrọ site n’inye ha data a n’ụzọ e doro nzuzo), anyị ga-ekpughe data gị naanị ma ọ bụrụ na:
- ụlọ ọrụ ndị ọzọ ma ọ bụ ndị mmadụ ọzọ ahụ ekwenye iji ya mee naanị ihe e kwekọrịtara, ọ bụghị maka ihe ọzọ ọ bụla; ma
- ụlọ ọrụ ndị ọzọ ma ọ bụ ndị mmadụ ọzọ ahụ ekwenye ịgbazekwa data gị dịka Ọkwa Nchekwa Ihe Nzuzo a siri kwuo nakwa dịka iwu nchedo data nke UK siri nye ikike.
Otu anyị si eji data gị eme ihe
- Site n’iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị kwetara ka anyị gbazekwa data gị gụnyere:
- adresị ozi ịntanetị gị;
- nkpughe na ị nọ n'okpuru ma ọ bụ na ị gafere afọ 18; na
- adresị IP gị
- Anyị ga-eji ozi a:
- imepụtara gị PIN nọmba dị nchebe maka ojiji gị nakwa iji gbochie ndị ọzọ ịnweta data gị n'ime webụsaịtị a; na
- izitere gị na ngwaọrụ gị ozi kwesịrị ekwesị ma zie ezi site n’ime webụsaịtị a.
- Anyị na-agbazekwa data gị site na nkwenye gị dịka e gosiri n'elu ma ọ bụ dịka ọ dị mkpa: (i) iji chebe ọdịmma gị dị mkpa, (ii) maka ebumnuche nke ọdịmma anyị ma ọ bụ nke ndị ọzọ (iji gwa gị okwu ma ọ bụ kparịta ụka; iji nyochaa ma ozi anyị nwere banyere gị ọ̀ ziri ezi na iji ghọtakwuo gị dịka onye na-eji ọrụ anyị eme ihe; maka nchekwa netwọk na ozi iji nyere anyị aka chebe ozi gị pụọ na ntufu ma ọ bụ mmebi, izu ohi ma ọ bụ ntinye na-enyeghị ikike; maka mgbochi nke wayo na mpụ ndị ọzọ; maka njikwa nke ajụjụ, mkpesa, ma ọ bụ nkwupụta; nakwa maka nkwado na nchekwa nke ikike ndị iwu nyere anyị); ma ọ bụ (iii) maka nrubeisi nye iwu nke anyị nọ n'okpuru ya.
- Iji mezuo arịrịọ gị maka iwepụ koodu foto gị na mgbasa ozi ọha na ọrụ mgbasa ozi ọha ndị ọzọ, a ga-ekerịta data gị nye ọrụ ndị ahụ nwere ike ịnọ n'èzí United Kingdom.Ebe o kwesịrị, ma ọ bụrụ na enweghị mwepụ n'okpuru Nkeji nke 49 nke UK General Data Protection Regulation, anyị na-etinye njikwa na usoro nkwekọrịta n'etiti anyị na ndị na-enye ọrụ ahụ iji chebe ikike gị n'ụzọ kwesịrị ekwesị.
- Anyị ga-ejigide data gị naanị n'oge niile ọ dị mkpa. Mgbe ọ bụla ị kagburu nkwenye gị maka ngbaze koodu foto ọ bụla, anyị ga-ehichapụ ụmụ koodu nchekwa gị n'ime sistemụ anyị ma gwa ụlọ ọrụ ndị anyị na ha na-emekọ ka ha meekwa otu ahụ. Biko mara, agbanyeghị, na ozugbo ụlọ ọrụ ndị anyị na ha na-emekọ matara banyere koodu nchekwa mebiri iwu ha, ha nwere ikike ịga n'ihu na-ewepụ ozi ahụ.
- Ozi ndị ọzọ gbasara oge ole anyị na-echekwa ozi dị n'ime Iwu Njigide anyị nke ị nwere ike ịrịọ ka e nye gị.
- Anyị ga-echekwa ozi ọ bụla i nyere anyị na rụta anyị nwere nchekwa ma ọ bụ na rụta nwere nchekwa nke ndị na-arụrụ anyị ọrụ wetara.
Kuki
- Webụsaịtị anyị na-etinye naanị kuki ndị dị ezigbo mkpa n'ime kọmputa gị iji mee ka anyị nwee ike irụrụ gị ọrụ ndị ahụ.
- N'ụzọ doro anya, anyị na-eji Google (Re) Captcha na skrin "Mepụta” ma ọ bụ "Wepụ" (Withdraw). Lịnk a na-akọwa kuki ndị ahụ. https://developers.google.com/recaptcha/docs/faq#does-recaptcha-use-cookies.
- Anyị na-ejikwa “IPInfo” ugbu a iji nweta Adreesị IP na Mpaghara e si zipụ ozi. Otú ha si eji Kuki na Iwu Nzuzo ha ka a kọwara na lịnki a. https://ipinfo.io/privacy-policy
Ikike Gị (Your Rights)
- Ebe anyị na-ahazi data gbasara gị, i nwere ikike ndị a:
- ikike ịmara na anyị na-eji ma ọ bụ na-echekwa data gbasara gị.
- Ọkwa Nchekwa Ihe Nzuzo a na-agwa gị maka nke a;
- ikike ịhụ ma nweta kọpị data gbasara gị anyị nwere;
- ikike ịjụ mgbasa ozi site n'iwepụ aha gị na ya;
- ikike ịjụ nhazi data gị a na-eme n'ihi ọdịmma ziri ezi;
- ikike ihichapụ ozi anyị na-eji ma ọ bụ nke anyị nwere gbasara gị;
- ikike ibugharị data;
- ikike ịjụ mkpebi a na-eme site n'igwe;
- ikike imezigharị data gị ma ọ bụrụ na o zighị ezi ma ọ bụ na o zughị ezi.
- Biko mara na ụfọdụ n'ime ikike ndị a abụghị maka mgbe niile, enwere ike inwe oge ụfọdụ mgbe anyị ga-eleghara ha anya.
Mkpesa
- Ọ bụrụ na i nwere nchegbu gbasara akụkụ ọ bụla nke nhazi data anyị ma ọ bụ data gbasara gị, biko kpọtụrụ anyị.
- Nkọwa otú a ga-esi kpọtụrụ anyị dị n’okpuru ebe a.
- Ọ bụrụ na anyị emezighị nchegbu gị, i nwere ikike ịgba akwụkwọ mkpesa n'ụlọ ọrụ UK Information Commissioner’s Office.
Ịkpọtụrụ Anyị
Biko gụọ ọkwa a nke ọma ma kpọtụrụ anyị ma ọ bụrụ na i nwere ajụjụ ọ bụla site n'izitere anyị ozi rịmami na: privacy@swgfl.org.uk.
Ma ọ bụ site n'idega akwụkwọ nye:
Onye Isi Nchekwa Ihe Nzuzo
South West Grid for Learning Trust
Belvedere House
Pynes Hill
Exeter
EX2 5WS
Ma ọ bụ site n'ekwentị na: 0345 601 3203
Anyị nwere ikike ịgbanwe Ọkwa Nchekwa Ihe Nzuzo a site n'oge gaa n'oge, anyị na-atụkwa aro ka ị na-elegharị ya anya oge ụfọdụ.
Emere mgbanwe ikpeazụ n'ụdị Ọkwa Nchekwa Ihe Nzuzo a n'ọnwa Nọvemba 2021.