Gbasara Anyị

StopNCII.org bụ nke Revenge Porn Helpline na-ahụ maka ya, nke bụ akụkụ nke SWGfL, ụlọ ọrụ ebere mba ụwa kweere na onye ọ bụla kwesịrị ịnweta uru site na teknụzụ, n'enweghị mmerụ ahụ.Ụlo ọrụ malitere n'afọ 2000, SWGfL na ọtụtụ ndị mmekọ na ndị nwere mmasị n'ọrụ ha n'ụwa niile na-arụkọ ọrụ iji chebe onye ọ bụla na ntanetị.

StopNCII.org na-eweta teknụzụ ọhụrụ nke ụlọ ọrụ teknụzụ na ndị ọrụ aka na-eji echebe ndị mmadụ ka a ghara ikesa foto ịgba ọtọ ha na ntaneti. Ngwaọrụ a pụrụ iche na-enye ndị okenye ọ bụla mmetọ a nwere ike imetụta ụzọ mgbochi ga-enyere ha aka inwe obi ike mgbe ọ bụla ha nọ na ntanetị.

Ebe nkwado maka mmetọ foto ọtọSWGfL - Nchekwa, Ntụkwasị obi, Ntanetị

E guzobere Revenge Porn Helpline (RPH) n'afọ 2015, ụlọ ọrụ na-enye ndị nkesa foto ịgba ọtọ n’anataghị ikike metụtara nkwado. Kemgbe e guzobere ya, Revenge Porn Helpline enyela puku kwuru puku ndị mmetọ foto ọtọ metụtara nkwado. Site n'ogo mwepụ karịrị 90%, ha ewepụla ihe karịrị foto igba ọtọ ndị mmadụ 300,000 ekesara n’anataghị ikike na ntanetị.

Maka ụlọ ọrụ nwere mmasị isoro anyị rụkọọ ọrụ, ma ọ bụ inye StopNCII.org nkwado, biko kpọtụrụ anyị.